Ụbọchị Ịrị ná Ịse nke Ọnwa January

há gwara anyị na anyị bú otú, ma jírí nkam ányá nara anyị ala na Legosu...

Ụbọchị Ịrị ná Ịse nke Ọnwa January

ọ bú taa,
na ụbọchị nkè iri ná ịse na afọ 1970
kà ndí agha Biafra mighachiri mma n’obo…

mkpebi ha na-ebi ndụ ịkwa ụta

ọbọdọ Naijiria jị aka nri nabata anyị
jírí áká ekpe te anyị okpo na ísì

ha jị ọnụ ọchị mako anyị
jírí áká ọdụ sugbuo anyị ka akpu

há buru ya dị ka abụ, ‘udo udo’
mànà omume ha bú ‘gbuo ha dum’

há gwara anyị na anyị bú otú
ma jírí nkam ányá nara anyị ala na Legosu,
nara anyị ụlọ na Ìgwèọcha, Asàbà, Benue,
nara anyị égo, hapụrụ anyị naira iri abụo naanị

há hụrụ na ígwè bú ike anyị
ya mèrè ha jírí kewa anyị
nyé ụfọdụ obodo anyị áhà ahụrụ
napu há ejiri màrà há

Naịjirịa kpọrọ ànyị ‘nwanne’
kwe ànyị nkwa udo ná ịdị n’otú
mana ọ bụ nkụ jupụtara na ndanda

Recommended Book by Jaachi

Kwality Content

It is a comprehensive guide for anyone who wants to master the art of creating engaging and effective content for digital media.

Jaachị Anyatọnwụ icon colour
Jaachị Anyatọnwụ

Jaachị Anyatọnwụ is a poet, editor, and publisher living in the suburbs of Aba. He is the author of numerous poetry chapbooks and collections including 'Under the Sheets', 'Write Me A Poem', '30', 'Isms', 'Amina', and many others.

Articles: 210

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Optimized by Optimole