Ụbọchị Ịrị ná Ịse nke Ọnwa January

há gwara anyị na anyị bú otú, ma jírí nkam ányá nara anyị ala na Legosu...

Ụbọchị Ịrị ná Ịse nke Ọnwa January

ọ bú taa,
na ụbọchị nkè iri ná ịse na afọ 1970
kà ndí agha Biafra mighachiri mma n’obo…

mkpebi ha na-ebi ndụ ịkwa ụta

ọbọdọ Naijiria jị aka nri nabata anyị
jírí áká ekpe te anyị okpo na ísì

ha jị ọnụ ọchị mako anyị
jírí áká ọdụ sugbuo anyị ka akpu

há buru ya dị ka abụ, ‘udo udo’
mànà omume ha bú ‘gbuo ha dum’

há gwara anyị na anyị bú otú
ma jírí nkam ányá nara anyị ala na Legosu,
nara anyị ụlọ na Ìgwèọcha, Asàbà, Benue,
nara anyị égo, hapụrụ anyị naira iri abụo naanị

há hụrụ na ígwè bú ike anyị
ya mèrè ha jírí kewa anyị
nyé ụfọdụ obodo anyị áhà ahụrụ
napu há ejiri màrà há

Naịjirịa kpọrọ ànyị ‘nwanne’
kwe ànyị nkwa udo ná ịdị n’otú
mana ọ bụ nkụ jupụtara na ndanda

Recommended Book by Jaachi

Kwality Content

It is a comprehensive guide for anyone who wants to master the art of creating engaging and effective content for digital media.

Jaachịmmá Anyatọnwụ
Jaachịmmá Anyatọnwụ

Jaachịmmá Anyatọnwụ (formally Jaachi Anyatonwu) is a creative entrepreneur, writer, and designer, and the Founder of Loopers Creative Agency, Ikike Arts, and Poemify Publishers. With over ten years of experience in branding, web design, content strategy, and creative direction, he help brands and audiences connect through clear, culturally resonant storytelling. Author of 'Content Writing: The Hows, Whys, and Whats' and voice behind the Bard Influence newsletter, Jaachịmmá is passionate about preserving the Igbo language and African narratives while inspiring modern audiences through design, poetry, and digital media.

Articles: 207

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *